Hosea 11

Ịhụnanya Chineke nye Izrel

1“Mgbe Izrel bụ nwantakịrị, ahụrụ m ya nʼanya,
ọ bụkwa site nʼIjipt ka m kpọpụtara nwa m.
2Ma dịka m na-akpọ ha,
otu a ka ha na-aga nʼebe dị anya site nʼebe m nọ.
Ha chụrụ Baal aja,
surekwa aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye arụsị dị iche iche.
3Ọ bụ mụ onwe m kuziiri Ifrem otu e si aga ije,
ejidere m ha nʼaka m abụọ,
ma ha amaghị
na ọ bụ mụ onwe m gwọrọ ya.
4Eji m ụdọ nke mmadụ bụ ebere,
na ịhụnanya duo ya.
Adịrị m ha dịka onye nʼebuli
ibu arọ site nʼolu ha,
ehulatakwara m ala, were aka m tinye ha nri nʼọnụ.

5“Ọ bụ na ha agaghị alaghachi azụ nʼIjipt,
Asịrịa ọ gaghị abụ eze ha,
nʼihi na ha ajụla ịlọghachikwute m?
6Mma agha ga-efegharị nʼobodo ha niile,
ọ ga-eripịa ndị nchụaja na-agba afa,
ọ ga-eripịakwa nzube ọjọọ ha niile.
7Ndị m ekpebiela nʼobi ha ịhapụ m.
Nʼagbanyeghị na ha na-akpọ m Chineke nke kachasị ihe niile elu,
ma mụ onwe m agaghị ebuli ha elu nʼụzọ ọbụla.

8“M ga-esi aṅaa rara gị nye, gị Ifrem?
M ga-esi aṅaa rara gị nye, gị Izrel?
M ga-esi aṅaa mee gị ka ịdị ka Adma?
M ga-esi aṅaa meso gị dịka Zeboiim?
Obi m na-akwasị akwa ike nʼime m;
ọ na-agụsị m agụụ ike inyere unu aka.
9Agaghị m emezu iwe ọkụ m
maọbụ bibiekwa Ifrem ọzọ.
Nʼihi na abụ m Chineke, abụghị m mmadụ.
Abụ m Onye Nsọ na-ebi nʼetiti unu.
Agaghị m emegidekwa obodo ha.
10Nʼihi na ha ga-agbaso Onyenwe anyị.
Ọ ga-agbọkwa ụja dịka ọdụm.
Mgbe ọ gbọrọ ụja,
ụmụ ya ga-eji ịma jijiji site nʼakụkụ ọdịda anyanwụ bịakwute ya.
11Dịka igwe nnụnụ
ka ha ga-ama jijiji bịa site nʼIjipt,
dịka nduru ka ha ga-efelata site nʼAsịrịa.
Aga m eme ka ha biri nʼụlọ ha ọzọ,”
otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

Mmehie Izrel

12Ifrem e jirila okwu ụgha gbaa m gburugburu,
ezinaụlọ Izrel e jirila aghụghọ na-emeso m omume,
ma Juda nọsịrị ike nʼekweghị nchịkọta nʼebe Chineke nọ,
ọbụladị megide Onye Nsọ ahụ nke kwesiri ntụkwasị obi.
Copyright information for IboBIU